Ọpụpụ 35:22
Exodus 35:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Exodus 35:22 in English
Exodus 35:22 · Berean Standard Bible
So all who had willing hearts, both men and women, came and brought brooches and earrings, rings and necklaces, and all kinds of gold jewelry. And they all presented their gold as a wave offering to the LORD.
Context
20Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ. 21Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ. 22Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 23Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri. 24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.