Ọpụpụ 35:23
Exodus 35:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri.
Exodus 35:23 in English
Exodus 35:23 · Berean Standard Bible
Everyone who had blue, purple, or scarlet yarn, or fine linen, goat hair, ram skins dyed red, or articles of fine leather, brought them.
Context
21Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ. 22Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 23Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri. 24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ. 25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.