Native Bible

Exodus 35:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.

Exodus 35:25 in English

Exodus 35:25 · Berean Standard Bible

Every skilled woman spun with her hands and brought what she had spun: blue, purple, or scarlet yarn, or fine linen.

Context

23Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri. 24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ. 25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye. 26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche. 27Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.