Native Bible

Exodus 35:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.

Exodus 35:26 in English

Exodus 35:26 · Berean Standard Bible

And all the skilled women whose hearts were stirred spun the goat hair.

Context

24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ. 25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye. 26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche. 27Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ. 28Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.