Ọpụpụ 30:33
Exodus 30:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ”
Exodus 30:33 in English
Exodus 30:33 · Berean Standard Bible
Anyone who mixes perfume like it or puts it on an outsider shall be cut off from his people.’”
Context
31Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 32Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ. 33A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ” 34Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe. 35Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.