Native Bible

Exodus 30:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe.

Exodus 30:34 in English

Exodus 30:34 · Berean Standard Bible

The LORD also said to Moses, “Take fragrant spices—gum resin, onycha, galbanum, and pure frankincense—in equal measures,

Context

32Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ. 33A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ” 34Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe. 35Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ. 36Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.