Ọpụpụ 30:14
Exodus 30:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.
Exodus 30:14 in English
Exodus 30:14 · Berean Standard Bible
Everyone twenty years of age or older who crosses over must give this offering to the LORD.
Context
12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ. 13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ.* Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị. 14Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a. 15Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie. 16Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.