Native Bible

Exodus 30:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ.* Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.

Exodus 30:13 in English

Exodus 30:13 · Berean Standard Bible

Everyone who crosses over to those counted must pay a half shekel,* according to the sanctuary shekel, which weighs twenty gerahs.* This half shekel is an offering to the LORD.

Context

11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ. 13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ.* Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị. 14Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a. 15Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.