Ọpụpụ 30:11
Exodus 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Exodus 30:11 in English
Exodus 30:11 · Berean Standard Bible
Then the LORD said to Moses,
Context
9Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya. 10Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie,* nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.” 11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ. 13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ.* Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.