Ọpụpụ 30:9
Exodus 30:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
Exodus 30:9 in English
Exodus 30:9 · Berean Standard Bible
On this altar you must not offer unauthorized * incense or a burnt offering or grain offering; nor are you to pour a drink offering on it.
Context
7“Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 8Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 9Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya. 10Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie,* nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.” 11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.