Ọpụpụ 30:7
Exodus 30:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
Exodus 30:7 in English
Exodus 30:7 · Berean Standard Bible
And Aaron is to burn fragrant incense on it every morning when he tends the lamps.
Context
5Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha. 6Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị. 7“Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 8Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 9Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.