Native Bible

Exodus 29:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.

Exodus 29:38 in English

Exodus 29:38 · Berean Standard Bible

This is what you are to offer regularly on the altar, each day: two lambs that are a year old.

Context

36Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ. 37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ. 38“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja. 39Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi. 40Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.