Native Bible

Exodus 29:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.

Exodus 29:39 in English

Exodus 29:39 · Berean Standard Bible

Offer one lamb in the morning and the other at twilight.*

Context

37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ. 38“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja. 39Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi. 40Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ. 41Jirikwa nwa atụrụ nke ọzọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ ya dịka i mere nʼụtụtụ. Aja isisi ya dị ezi mma, nke e sitere nʼọkụ a na-achụ nye Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.