Native Bible

Exodus 29:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.

Exodus 29:36 in English

Exodus 29:36 · Berean Standard Bible

Sacrifice a bull as a sin offering each day for atonement. Purify the altar by making atonement for it, and anoint it to consecrate it.

Context

34Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ. 35“Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ. 36Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ. 37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ. 38“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.