Ọpụpụ 29:35
Exodus 29:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ.
Exodus 29:35 in English
Exodus 29:35 · Berean Standard Bible
This is what you are to do for Aaron and his sons based on all that I have commanded you, taking seven days to ordain them.
Context
33Ha ga-eri ihe ndị aja niile ahụ nke e ji chụọ aja mkpuchi mmehie, nʼoge ido nsọ ha. Ọ dịghị onye ọbụla ọzọ ga-eso ha rie ya, nʼihi na ha bụ ihe dị nsọ. 34Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ. 35“Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ. 36Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ. 37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.