Ọpụpụ 28:19
Exodus 28:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
Exodus 28:19 in English
Exodus 28:19 · Berean Standard Bible
in the third row a jacinth, an agate, and an amethyst;
Context
17Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril, 18nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ. 19Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti. 20Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa. 21Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.