Ọpụpụ 28:17
Exodus 28:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,
Exodus 28:17 in English
Exodus 28:17 · Berean Standard Bible
And mount on it a setting of gemstones, four rows of stones:* In the first row there shall be a ruby, a topaz, and an emerald;
Context
15“Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya. 16Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ. 17Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril, 18nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ. 19Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.