Native Bible

Exodus 26:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.

Exodus 26:15 in English

Exodus 26:15 · Berean Standard Bible

You are to construct upright frames of acacia wood for the tabernacle.

Context

13Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya. 14Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya. 15“Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ. 16Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara. 17Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.