Native Bible

Exodus 26:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.

Exodus 26:13 in English

Exodus 26:13 · Berean Standard Bible

And the tent curtains will be a cubit * longer on either side, and the excess will hang over the sides of the tabernacle to cover it.

Context

11Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu. 12Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ. 13Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya. 14Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya. 15“Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.