Ọpụpụ 24:4
Exodus 24:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel.
Exodus 24:4 in English
Exodus 24:4 · Berean Standard Bible
And Moses wrote down all the words of the LORD. Early the next morning he got up and built an altar at the base of the mountain, along with twelve pillars for the twelve tribes of Israel.
Context
2Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.” 3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.” 4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel. 5Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị. 6Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.