Native Bible

Exodus 24:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”

Exodus 24:2 in English

Exodus 24:2 · Berean Standard Bible

Moses alone shall approach the LORD, but the others must not come near. And the people may not go up with him.”

Context

1Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya. 2Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.” 3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.” 4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.