Ọpụpụ 24:5
Exodus 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.
Exodus 24:5 in English
Exodus 24:5 · Berean Standard Bible
Then he sent out some young men of Israel, and they offered burnt offerings and sacrificed young bulls as peace offerings to the LORD.
Context
3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.” 4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel. 5Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị. 6Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 7Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.