Native Bible

Exodus 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.

Exodus 24:6 in English

Exodus 24:6 · Berean Standard Bible

Moses took half of the blood and put it in bowls, and the other half he sprinkled on the altar.

Context

4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel. 5Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị. 6Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 7Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.” 8Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.