Native Bible

Exodus 2:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.

Exodus 2:24 in English

Exodus 2:24 · Berean Standard Bible

So God heard their groaning, and He remembered His covenant with Abraham, Isaac, and Jacob.

Context

22Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.” 23O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị. 24Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara. 25Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi. 2:3 Bụ ahịhịa na-epu nʼakụkụ mmiri 2:15 Midian bụ otu nʼime ụmụ Ebraham mụtara nʼikpeazụ. Jen 25:2 Ndị Midia na-ebi nʼakụkụ ugwu nke Ugwu Saịnaị. 2:18 Reuel bụ aha ọzọ e ji mara Jetro ọgọ Mosis. Ọpụ 3:1; Ọnụ 10:29

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.