Ọpụpụ 2:23
Exodus 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.
Exodus 2:23 in English
Exodus 2:23 · Berean Standard Bible
After a long time, the king of Egypt died. The Israelites groaned and cried out under their burden of slavery, and their cry for deliverance from bondage ascended to God.
Context
21Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 22Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.” 23O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị. 24Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara. 25Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
2:3 Bụ ahịhịa na-epu nʼakụkụ mmiri
2:15 Midian bụ otu nʼime ụmụ Ebraham mụtara nʼikpeazụ. Jen 25:2 Ndị Midia na-ebi nʼakụkụ ugwu nke Ugwu Saịnaị.
2:18 Reuel bụ aha ọzọ e ji mara Jetro ọgọ Mosis. Ọpụ 3:1; Ọnụ 10:29
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.