Native Bible

Exodus 17:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”

Exodus 17:4 in English

Exodus 17:4 · Berean Standard Bible

Then Moses cried out to the LORD, “What should I do with these people? A little more and they will stone me!”

Context

2Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?” 3Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?” 4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.” 5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa. 6Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.