Ọpụpụ 17:3
Exodus 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”
Exodus 17:3 in English
Exodus 17:3 · Berean Standard Bible
But the people thirsted for water there, and they grumbled against Moses: “Why have you brought us out of Egypt—to make us and our children and livestock die of thirst?”
Context
1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ. 2Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.”
Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?” 3Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?” 4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.” 5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.