Native Bible

Exodus 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.

Exodus 17:5 in English

Exodus 17:5 · Berean Standard Bible

And the LORD said to Moses, “Walk on ahead of the people and take some of the elders of Israel with you. Take along in your hand the staff with which you struck the Nile, and go.

Context

3Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?” 4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.” 5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa. 6Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile. 7Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.