Ọpụpụ 15:2
Exodus 15:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
Exodus 15:2 in English
Exodus 15:2 · Berean Standard Bible
The LORD is my strength and my song, and He has become my salvation. He is my God, and I will praise Him, my father’s God, and I will exalt Him.
Context
1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị,
“Aga m abụku Onyenwe anyị abụ
nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu.
Ọ tụnyela ịnyịnya
na onye na-agba ya nʼosimiri. 2“Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m.
Ọ ghọrọla m nzọpụta.
Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya,
Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu. 3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ.
Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị. 4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya,
ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ.
Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ,
ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.