Native Bible

Exodus 15:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.

Exodus 15:13 in English

Exodus 15:13 · Berean Standard Bible

With loving devotion * You will lead the people You have redeemed; with Your strength You will guide them to Your holy dwelling.

Context

11Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ.* Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube? 12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile. 13Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ. 14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị. 15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.