Ọpụpụ 13:21
Exodus 13:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.
Exodus 13:21 in English
Exodus 13:21 · Berean Standard Bible
And the LORD went before them in a pillar of cloud to guide their way by day, and in a pillar of fire to give them light by night, so that they could travel by day or night.
Context
19Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.” 20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. 21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. 22Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
13:13 Ịnyịnya ibu bụ otu nʼime anụ na-adịghị ọcha na nke e kwesighị ka e jiri ya nye onyinye ọbụla. Ọnụ 18:15; Lev 11:2-23 Ma nʼihi iba uru ha nʼihe banyere ọrụ, Chineke nyere oghere maka iji nwa atụrụ gbara ha.
13:17 Ụzọ ahụ dị nso nke ha esiteghị, jupụtara nʼọtụtụ ebe mgbaba e wusiri ike nke ndị agha Ijipt na-eche nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.