Ọpụpụ 13:22
Exodus 13:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha. 13:13 Ịnyịnya ibu bụ otu nʼime anụ na-adịghị ọcha na nke e kwesighị ka e jiri ya nye onyinye ọbụla. Ọnụ 18:15; Lev 11:2-23 Ma nʼihi iba uru ha nʼihe banyere ọrụ, Chineke nyere oghere maka iji nwa atụrụ gbara ha. 13:17 Ụzọ ahụ dị nso nke ha esiteghị, jupụtara nʼọtụtụ ebe mgbaba e wusiri ike nke ndị agha Ijipt na-eche nche.
Exodus 13:22 in English
Exodus 13:22 · Berean Standard Bible
Neither the pillar of cloud by day nor the pillar of fire by night left its place before the people.
Context
20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. 21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. 22Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
13:13 Ịnyịnya ibu bụ otu nʼime anụ na-adịghị ọcha na nke e kwesighị ka e jiri ya nye onyinye ọbụla. Ọnụ 18:15; Lev 11:2-23 Ma nʼihi iba uru ha nʼihe banyere ọrụ, Chineke nyere oghere maka iji nwa atụrụ gbara ha.
13:17 Ụzọ ahụ dị nso nke ha esiteghị, jupụtara nʼọtụtụ ebe mgbaba e wusiri ike nke ndị agha Ijipt na-eche nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.