Native Bible

Exodus 13:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.

Exodus 13:20 in English

Exodus 13:20 · Berean Standard Bible

They set out from Succoth and camped at Etham on the edge of the wilderness.

Context

18Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ. 19Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.” 20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. 21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. 22Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha. 13:13 Ịnyịnya ibu bụ otu nʼime anụ na-adịghị ọcha na nke e kwesighị ka e jiri ya nye onyinye ọbụla. Ọnụ 18:15; Lev 11:2-23 Ma nʼihi iba uru ha nʼihe banyere ọrụ, Chineke nyere oghere maka iji nwa atụrụ gbara ha. 13:17 Ụzọ ahụ dị nso nke ha esiteghị, jupụtara nʼọtụtụ ebe mgbaba e wusiri ike nke ndị agha Ijipt na-eche nche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.