Native Bible

Exodus 12:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.

Exodus 12:46 in English

Exodus 12:46 · Berean Standard Bible

It must be eaten inside one house. You are not to take any of the meat outside the house, and you may not break any of the bones.

Context

44Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu. 45Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya. 46“A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. 47Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a. 48“Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.