Native Bible

Exodus 12:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.

Exodus 12:16 in English

Exodus 12:16 · Berean Standard Bible

On the first day you are to hold a sacred assembly, and another on the seventh day. You must not do any work on those days, except to prepare the meals—that is all you may do.

Context

14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 15Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko.* Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel. 16Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri. 17“Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ 18Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.