Native Bible

Exodus 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko.* Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.

Exodus 12:15 in English

Exodus 12:15 · Berean Standard Bible

For seven days you must eat unleavened bread. On the first day you are to remove the leaven from your houses. Whoever eats anything leavened from the first day through the seventh must be cut off from Israel.

Context

13Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt. 14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 15Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko.* Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel. 16Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri. 17“Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.