Native Bible

Exodus 12:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Exodus 12:14 in English

Exodus 12:14 · Berean Standard Bible

And this day will be a memorial for you, and you are to celebrate it as a feast to the LORD, as a permanent statute for the generations to come.

Context

12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị. 13Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt. 14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 15Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko.* Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel. 16Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.