Native Bible

Exodus 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.”

Exodus 10:9 in English

Exodus 10:9 · Berean Standard Bible

“We will go with our young and old,” Moses replied. “We will go with our sons and daughters, and with our flocks and herds, for we must hold a feast to the LORD.”

Context

7Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?” 8Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?” 9Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.” 10Fero sịrị, “Ka Onyenwe anyị nọnyere unu. Ma agaghị m ekwe ka unu na ndị inyom unu, na ụmụntakịrị unu gaa. O doro anya na unu na-atụ atụmatụ ọjọọ nʼime obi unu. 11Ọ gaghị adị otu a! Jeenụ naanị* unu bụ ndị ikom gaa fee Onyenwe anyị unu ofufe, nʼihi na nke a bụ ihe unu na-arịọ.” Mgbe ahụ a chụpụrụ Mosis na Erọn site nʼihu Fero.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.