Native Bible

Exodus 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?”

Exodus 10:8 in English

Exodus 10:8 · Berean Standard Bible

So Moses and Aaron were brought back to Pharaoh. “Go, worship the LORD your God,” he said. “But who exactly will be going?”

Context

6Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ. 7Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?” 8Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?” 9Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.” 10Fero sịrị, “Ka Onyenwe anyị nọnyere unu. Ma agaghị m ekwe ka unu na ndị inyom unu, na ụmụntakịrị unu gaa. O doro anya na unu na-atụ atụmatụ ọjọọ nʼime obi unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.