Native Bible

Exodus 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?”

Exodus 10:7 in English

Exodus 10:7 · Berean Standard Bible

Pharaoh’s officials asked him, “How long will this man be a snare to us? Let the people go, so that they may worship the LORD their God. Do you not yet realize that Egypt is in ruins?”

Context

5Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu. 6Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ. 7Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?” 8Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?” 9Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.