Native Bible

Esther 9:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.”

Esther 9:12 in English

Esther 9:12 · Berean Standard Bible

who said to Queen Esther, “In the citadel of Susa the Jews have killed and destroyed five hundred men, including Haman’s ten sons. What have they done in the rest of the royal provinces? Now what is your petition? It will be given to you. And what further do you request? It will be fulfilled.”

Context

10ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri Heman nwa Hamedata, onye iro ndị Juu mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka. 11Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa. 12Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.” 13Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.” 14Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.