Native Bible

Esther 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.”

Esther 9:13 in English

Esther 9:13 · Berean Standard Bible

Esther replied, “If it pleases the king, may the Jews in Susa also have tomorrow to carry out today’s edict, and may the bodies of Haman’s ten sons be hanged on the gallows.”

Context

11Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa. 12Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.” 13Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.” 14Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi. 15Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.