Native Bible

Esther 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.

Esther 9:14 in English

Esther 9:14 · Berean Standard Bible

So the king commanded that this be done. An edict was issued in Susa, and they hanged the ten sons of Haman.

Context

12Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.” 13Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.” 14Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi. 15Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka. 16Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.