Native Bible

Esther 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”

Esther 7:2 in English

Esther 7:2 · Berean Standard Bible

and as they drank their wine on that second day, the king asked once more, “Queen Esther, what is your petition? It will be given to you. What is your request? Even up to half the kingdom, it will be fulfilled.”

Context

1Eze na Heman gara iri oriri ahụ Esta nwunye eze kpọrọ ha, 2mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.” 3Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m. 4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.