Native Bible

Esther 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”

Esther 7:4 in English

Esther 7:4 · Berean Standard Bible

For my people and I have been sold out to destruction, death, and annihilation. If we had merely been sold as menservants and maidservants, I would have remained silent, because no such distress would justify burdening the king.”

Context

2mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.” 3Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m. 4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.” 5Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?” 6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.