Native Bible

Esther 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.

Esther 7:6 in English

Esther 7:6 · Berean Standard Bible

Esther replied, “The adversary and enemy is this wicked man—Haman!” And Haman stood in terror before the king and queen.

Context

4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.” 5Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?” 6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze. 7Eze biliri ọtọ nʼiwe,* hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi. 8Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.