Native Bible

Esther 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.*

Esther 7:8 in English

Esther 7:8 · Berean Standard Bible

Just as the king returned from the palace garden to the banquet hall, Haman was falling on the couch where Esther was reclining. The king exclaimed, “Would he actually assault the queen while I am in the palace?” As soon as the words had left the king’s mouth, they covered Haman’s face.

Context

6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze. 7Eze biliri ọtọ nʼiwe,* hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi. 8Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.* 9Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, “Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe ọ chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman.” Eze sịrị, “Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!” 10Ya mere, ha kwụgburu Heman nʼosisi ahụ ọ kwadoro maka Mọdekai. Iwe eze dajụkwara. 7:7 1:12 7:8 Ị ji akwa kpukwasị mmadụ nʼihu, maọbụ iji akwa kpuchie isi mmadụ nʼoge ahụ, ọkachasị ma ọ bụrụ nʼihe metụtara eze, pụtara na a maala onye dị otu a ikpe ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.