Esta 4:16
Esther 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
Esther 4:16 in English
Esther 4:16 · Berean Standard Bible
“Go and assemble all the Jews who can be found in Susa, and fast for me. Do not eat or drink for three days, night or day, and I and my maidens will fast as you do. After that, I will go to the king, even though it is against the law. And if I perish, I perish!*”
Context
14Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?” 15Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị; 16“Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!” 17Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.