Esta 4:14
Esther 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?”
Esther 4:14 in English
Esther 4:14 · Berean Standard Bible
For if you remain silent at this time, relief and deliverance for the Jews will arise from another place, but you and your father’s house will perish. And who knows if perhaps you have come to the kingdom for such a time as this?”
Context
12Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara, 13o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile. 14Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?” 15Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị; 16“Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.