Ekiliziastis 9:6
Ecclesiastes 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. Ha agaghị enwekwa oke nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
Ecclesiastes 9:6 in English
Ecclesiastes 9:6 · Berean Standard Bible
Their love, their hate, and their envy have already vanished, and they will never again have a share in all that is done under the sun.
Context
4Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ. 5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,
ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;
ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,
nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu. 6Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,
na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.
Ha agaghị enwekwa oke
nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ. 7Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. 8Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.